|
KWENU! Our culture, our future |
|
Ọgụgọ Ọjị Afọ Ọfụụ
Monday, January 1, 2007
Ndiibe anyị, ekenekwee m unu. Onye wetere ọjị, wetere ndụ. Nke onye na-eme, ya gazie. Udo ka m ji bịa, udo ka m ga-eji laa. Onye bịara n'ebe onye abịagbule ya; Mgbe ọ ga-ala, mkpumkpu apụkwala ya n’azụ. Onye lụa, ya rie; onye rie, ya ñụrịa. Nke onye chiri, ya zere.
Egbe bere; ugo bere. Ndụ nwoke; ndụ nwaanyị. Okenye ga-adị; nwata ga-adị. Ọsa na nkwụ; uze na nkwụ. Onye biri, ibe ya biri. Ndụ mmiri bụ ndụ azụ. Ọgaranya ga-ebi; ogbenye ga-ebi. Ọkwụrụ mịara ikwu, ya mịara ibe.
Mmadụ, egbune mmụọ; Mmụọ, egbune mmadụ. Nwoke, egbune nwaanyị; nwaanyị, egbune nwoke. Eju agbọnyụla ọkụ; ọkụ agbagbule eju. Nke m dịrị m; nke onye dịrị ya. Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri Mmiri zowe; anwụ chawa. Onye Chi meere, ya meere ibe. Nwanne, ndụ; nwanna, ndụ.
Ndiichie, biko bịa nụ taa ọjị. Mmụọ ndị anyị ma, bịa nụ taa ọjị. Mmụọ na-emere anyị mma, bịa nụ taa ọjị. Anị, biko bịakwa taa ọjị. Unu zụkọ, biko nu chebe nụ Ndiigbo niile; Chebe ma dube nu mmadụ niile n’ụwa nke a; Mere nụ anyị ihe ọma karịa ka anyị chere, Site n’iké nke Chineke bụ Ezechitoke, ofu Chi Ukwu ụwatụwa niile!
ISÉE
Kolanut Consecration ©M. O. ENE
|
|
www.kwenu.com: Simply surprise yourself yonder! |