KWENU! Our culture, our future

gụgọ j Afọ fụụ

 

Monday, January 1, 2007

 

Ndiibe any, ekenekwee m unu.

Onye wetere j, wetere nd.

Nke onye na-eme, ya gazie.

Udo ka m ji ba, udo ka m ga-eji laa.

Onye bara n'ebe onye abagbule ya;

Mgbe ga-ala, mkpumkpu apkwala ya n’az.

Onye la, ya rie; onye rie, ya ñụra.

Nke onye chiri, ya zere.

 

Egbe bere; ugo bere.

Ndụ nwoke; ndụ nwaanyị.

Okenye ga-adị; nwata ga-adị.

Ọsa na nkwụ; uze na nkwụ.

Onye biri, ibe ya biri.

Ndụ mmiri bụ ndụ azụ.

Ọgaranya ga-ebi; ogbenye ga-ebi.

Ọkwụrụ mịara ikwu, ya mịara ibe.

 

Mmadụ, egbune mmụọ; Mmụọ, egbune mmadụ.

Nwoke, egbune nwaanyị; nwaanyị, egbune nwoke.

Eju agbọnyụla ọkụ; ọkụ agbagbule eju.

Nke m dịrị m; nke onye dịrị ya.

Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri

Mmiri zowe; anwụ chawa.

Onye Chi meere, ya meere ibe.

Nwanne, ndụ; nwanna, ndụ.

 

Ndiichie, biko bịa nụ taa ọjị.

Mmụọ ndị anyị ma, bịa nụ taa ọjị.

Mmụọ na-emere anyị mma, bịa nụ taa ọjị.

Anị, biko bịakwa taa ọjị.

Unu zụkọ, biko nu chebe nụ Ndiigbo niile;

Chebe ma dube nu mmad niile n’ụwa nke a;

Mere nụ anyị ihe ọma karịa ka anyị chere,

Site n’iké nke Chineke bụ Ezechitoke, ofu Chi Ukwu ụwatụwa niile!

 

ISÉE

 

Kolanut Consecration

©M. O. ENE

egbedaa@aol.com

www.kwenu.com: Simply surprise yourself yonder!