|
KWENU! Our culture, our future |
|
Ogugo Oji Afo Ofuu
Sunday, January 1, 2006
Ndiibe anyi, ekenekwee m unu. Onye wetere oji, wetere ndu. Nke onye na-eme, ya gazie. Udo ka m ji bia, udo ka m ga-eji laa. Onye biara ebe onye abiagbula ya; mgbe o ga-ala, mkpumkpu apukwala ya n’azu. Onye lua, ya rie; onye rie, ya ñuria.
Egbe bere; ugo bere. Ndụ nwoke; ndụ nwaanyị. Okenye ga-adị; nwata ga-adị. Ọsa na nkwụ; uze na nkwụ.
Onye biri; ibe ya biri. Ndụ mmiri; ndụ azụ. Ọgaranya ga-ebi; ogbenye ga-ebi. Ọkwụrụ mịara ikwu, ya mịara ibe.
Mmadụ egbune mmụọ; mmụọ egbune mmadụ. Nwoke egbune nwaanyị; nwaanyị egbune nwoke. Eju agbọnyụla ọkụ; ọkụ agbagbula eju. Nke m dịrị m; nke onye dịrị ya.
Aka-nri kwọọ aka-ekpe; aka-ekpe akwọọ aka-nri Mmiri zowe; anwụ chawa. Onye Chi meere, ya meere ibe. Nwanne, ndụ; nwanna, ndụ.
Ndiichie, biko bia nu taa oji. Mmuo ndi anyi ma, na ndi anyi amaghi -- mmuo niile na-emere anyi ihe oma, bia nu taa oji. Ani, biakwa taa oji. Unu zuko, biko nu chebe nu Ndiigbo niile nakwa ndienyi ha bi n’uwa nke a; dube nu anyi, mere nu anyi ihe anyi bu n’obi karia ka anyi chere, site n’iké nke Chineke bu Ezechitoke, ofu Chi Ukwu uwatuwa niile!
ISÉE
© MOE, 2006 |
|
www.kwenu.com: Simply surprise yourself yonder! |