KWENU! Our culture, our future

Ogugo Oji Afo Ofuu

 

egbedaa@aol.com

 

Sunday, January 1, 2006

 

Ndiibe anyi, ekenekwee m unu. Onye wetere oji, wetere ndu. Nke onye na-eme, ya gazie. Udo ka m ji bia, udo ka m ga-eji laa. Onye biara ebe onye abiagbula ya; mgbe o ga-ala, mkpumkpu apukwala ya n’azu. Onye lua, ya rie; onye rie, ya ñuria.

 

Egbe bere; ugo bere.

Ndụ nwoke; ndụ nwaanyị.

Okenye ga-adị; nwata ga-adị.

Ọsa na nkwụ; uze na nkwụ.

 

Onye biri; ibe ya biri.

Ndụ mmiri; ndụ azụ.

Ọgaranya ga-ebi; ogbenye ga-ebi.

Ọkwụrụ mịara ikwu, ya mịara ibe.

 

Mmadụ egbune mmụọ; mmụọ egbune mmadụ.

Nwoke egbune nwaanyị; nwaanyị egbune nwoke.

Eju agbọnyụla ọkụ; ọkụ agbagbula eju.

Nke m dịrị m; nke onye dịrị ya.

 

Aka-nri kwọọ aka-ekpe; aka-ekpe akwọọ aka-nri

Mmiri zowe; anwụ chawa.

Onye Chi meere, ya meere ibe.

Nwanne, ndụ; nwanna, ndụ.

 

Ndiichie, biko bia nu taa oji. Mmuo ndi anyi ma, na ndi anyi amaghi -- mmuo niile na-emere anyi ihe oma, bia nu taa oji. Ani, biakwa taa oji. Unu zuko, biko nu chebe nu Ndiigbo niile nakwa ndienyi ha bi n’uwa nke a; dube nu anyi, mere nu anyi ihe anyi bu n’obi karia ka anyi chere, site n’iké nke Chineke bu Ezechitoke, ofu Chi Ukwu uwatuwa niile!

 

ISÉE

 

© MOE, 2006

www.kwenu.com: Simply surprise yourself yonder!